Native Bible

Isaiah 56:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke; ha adịghị enwe afọ ojuju. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta, ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha, onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya.

Isaiah 56:11 in English

Isaiah 56:11 · Berean Standard Bible

Like ravenous dogs, they are never satisfied. They are shepherds with no discernment; they all turn to their own way, each one seeking his own gain:

Context

9Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa. Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa. 10Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya. 11Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke; ha adịghị enwe afọ ojuju. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta, ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha, onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya. 12Onye ọbụla na-asị, “Bịa ka m weta mmanya, ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị. Echi ga-adịkwa ka taa, ma ọ bụkwanụ dị mma karịa.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.