Ekiliziastis 10
Ecclesiastes 10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ.
Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ. 2Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi,
ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie. 3Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya,
nʼihi na o maghị ihe.
Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu* ọsịịsọ. 4Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị,
ahapụla ọnọdụ gị,
nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ. 5Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ,
dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie. 6Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu,
ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha. 7Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya,
ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu. 8Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya!
Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu. 9Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị.
Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha. 10Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ,
ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ,
a ga-etinye ike karịa,
ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi. 11Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ,
ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ. 12Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara,
ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi 13Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu,
ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara. 14Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.
Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime,
onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ? 15Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike,
ha makwaghị ụzọ ijeru obodo. 16Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị,
nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ. 17Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ,
nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike,
ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke. 18Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri;
ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze. 19Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị,
mmanya na-enye obi ụtọ,
ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile. 20Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị*;
maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị,
nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gị
nwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru.
10:3 Ilu 13:16; Ilu 18:2
10:20 Ọpụ 22:28; Ọrụ 23:5
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.