Native Bible

Ecclesiastes 10:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri; ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.

Ecclesiastes 10:18 in English

Ecclesiastes 10:18 · Berean Standard Bible

Through laziness the roof caves in, and in the hands of the idle, the house leaks.

Context

16Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị, nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ. 17Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ, nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike, ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke. 18Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri; ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze. 19Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị, mmanya na-enye obi ụtọ, ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile. 20Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị*; maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị, nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gị nwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru. 10:3 Ilu 13:16; Ilu 18:2 10:20 Ọpụ 22:28; Ọrụ 23:5

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.