Ekiliziastis 10:16
Ecclesiastes 10:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị, nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.
Ecclesiastes 10:16 in English
Ecclesiastes 10:16 · Berean Standard Bible
Woe to you, O land whose king is a youth,* and whose princes feast in the morning.
Context
14Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.
Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime,
onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ? 15Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike,
ha makwaghị ụzọ ijeru obodo. 16Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị,
nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ. 17Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ,
nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike,
ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke. 18Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri;
ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.