Ekiliziastis 10:14
Ecclesiastes 10:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu. Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?
Ecclesiastes 10:14 in English
Ecclesiastes 10:14 · Berean Standard Bible
Yet the fool multiplies words. No one knows what is coming, and who can tell him what will come after him?
Context
12Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara,
ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi 13Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu,
ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara. 14Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.
Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime,
onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ? 15Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike,
ha makwaghị ụzọ ijeru obodo. 16Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị,
nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.