Ekiliziastis 10:3
Ecclesiastes 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya, nʼihi na o maghị ihe. Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu* ọsịịsọ.
Ecclesiastes 10:3 in English
Ecclesiastes 10:3 · Berean Standard Bible
Even as the fool walks along the road, his sense is lacking, and he shows everyone that he is a fool.
Context
1Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ.
Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ. 2Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi,
ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie. 3Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya,
nʼihi na o maghị ihe.
Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu* ọsịịsọ. 4Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị,
ahapụla ọnọdụ gị,
nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ. 5Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ,
dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.