Native Bible

Ecclesiastes 10:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ, ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.

Ecclesiastes 10:11 in English

Ecclesiastes 10:11 · Berean Standard Bible

If the snake bites before it is charmed, there is no profit for the charmer.

Context

9Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha. 10Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ, ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ, a ga-etinye ike karịa, ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi. 11Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ, ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ. 12Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara, ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi 13Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu, ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.