Native Bible

Ecclesiastes 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.

Ecclesiastes 10:8 in English

Ecclesiastes 10:8 · Berean Standard Bible

He who digs a pit may fall into it, and he who breaches a wall may be bitten by a snake.

Context

6Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu, ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha. 7Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu. 8Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu. 9Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha. 10Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ, ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ, a ga-etinye ike karịa, ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.