Native Bible

Ecclesiastes 10:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.

Ecclesiastes 10:7 in English

Ecclesiastes 10:7 · Berean Standard Bible

I have seen slaves on horseback, while princes go on foot like slaves.

Context

5Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie. 6Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu, ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha. 7Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu. 8Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu. 9Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.