Zefanaya 2:12
Zephaniah 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Unu ndị Itiopia,* a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”
Zephaniah 2:12 in English
Zephaniah 2:12 · Berean Standard Bible
“You too, O Cushites,* will be slain by My sword.”
Context
10Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha,
na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide
ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 11Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ,
mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi.
Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya,
onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile. 12“Unu ndị Itiopia,*
a ghaghị iji mma agha gbuo unu.” 13Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu,
laa Asịrịa nʼiyi.
Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu,
ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara. 14Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ,
ha na ihe e kere eke dị iche iche.
Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo
ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ.
Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku,
mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile,
ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.