Zefanaya 2:11
Zephaniah 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.
Zephaniah 2:11 in English
Zephaniah 2:11 · Berean Standard Bible
The LORD will be terrifying to them when He starves all the gods of the earth. Then the nations of every shore will bow in worship to Him, each in its own place.
Context
9Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
bụ Chineke Izrel, kwubiri ya,
“aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm,
mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra.
Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara,
na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.
Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha,
ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.” 10Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha,
na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide
ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 11Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ,
mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi.
Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya,
onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile. 12“Unu ndị Itiopia,*
a ghaghị iji mma agha gbuo unu.” 13Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu,
laa Asịrịa nʼiyi.
Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu,
ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.