Native Bible

Zephaniah 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.

Zephaniah 2:13 in English

Zephaniah 2:13 · Berean Standard Bible

And He will stretch out His hand against the north and destroy Assyria; He will make Nineveh a desolation, as dry as a desert.

Context

11Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile. 12“Unu ndị Itiopia,* a ghaghị iji mma agha gbuo unu.” 13Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara. 14Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe. 15Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri, nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla; nke na-asị onwe ya, “Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.” Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu; lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi. Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ, ma fufekwaa isi ya. 2:12 Maọbụ, Kush

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.