Zefanaya 2:13
Zephaniah 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.
Zephaniah 2:13 in English
Zephaniah 2:13 · Berean Standard Bible
And He will stretch out His hand against the north and destroy Assyria; He will make Nineveh a desolation, as dry as a desert.
Context
11Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ,
mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi.
Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya,
onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile. 12“Unu ndị Itiopia,*
a ghaghị iji mma agha gbuo unu.” 13Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu,
laa Asịrịa nʼiyi.
Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu,
ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara. 14Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ,
ha na ihe e kere eke dị iche iche.
Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo
ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ.
Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku,
mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile,
ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe. 15Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri,
nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla;
nke na-asị onwe ya,
“Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.”
Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu;
lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi.
Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ,
ma fufekwaa isi ya.
2:12 Maọbụ, Kush
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.