Zefanaya 2:14
Zephaniah 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.
Zephaniah 2:14 in English
Zephaniah 2:14 · Berean Standard Bible
Herds will lie down in her midst, creatures of every kind.* Both the desert owl and screech owl * will roost atop her pillars. Their calls will sound from the window, but desolation will lie on the threshold, for He will expose the beams of cedar.
Context
12“Unu ndị Itiopia,*
a ghaghị iji mma agha gbuo unu.” 13Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu,
laa Asịrịa nʼiyi.
Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu,
ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara. 14Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ,
ha na ihe e kere eke dị iche iche.
Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo
ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ.
Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku,
mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile,
ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe. 15Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri,
nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla;
nke na-asị onwe ya,
“Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.”
Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu;
lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi.
Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ,
ma fufekwaa isi ya.
2:12 Maọbụ, Kush
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.