Zefanaya 2:10
Zephaniah 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Zephaniah 2:10 in English
Zephaniah 2:10 · Berean Standard Bible
This they shall have in return for their pride, for taunting and mocking the people of the LORD of Hosts.
Context
8“Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab,
na ịkwa emo niile nke ndị Amọn,
nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m
na-anya isi na ha ga-ewere ala ha. 9Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
bụ Chineke Izrel, kwubiri ya,
“aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm,
mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra.
Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara,
na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.
Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha,
ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.” 10Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha,
na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide
ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 11Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ,
mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi.
Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya,
onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile. 12“Unu ndị Itiopia,*
a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.