Abụ nke Abụ 2:5
Song of Songs 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.
Song of Songs 2:5 in English
Song of Songs 2:5 · Berean Standard Bible
Sustain me with raisins; refresh me with apples, for I am faint with love.
Context
3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa,
mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ.
Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya,
mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ. 4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri,
ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya. 5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume;
werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike,
nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa. 6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,
aka nri ya na-ejikụ m. 7Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị:
Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta,
ruo mgbe ọ masịrị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.