Native Bible

Song of Songs 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.

Song of Songs 2:5 in English

Song of Songs 2:5 · Berean Standard Bible

Sustain me with raisins; refresh me with apples, for I am faint with love.

Context

3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa, mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ. Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya, mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ. 4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya. 5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa. 6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m. 7Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị: Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta, ruo mgbe ọ masịrị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.