Native Bible

Song of Songs 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m.

Song of Songs 2:6 in English

Song of Songs 2:6 · Berean Standard Bible

His left hand is under my head, and his right arm embraces me.

Context

4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya. 5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa. 6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m. 7Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị: Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta, ruo mgbe ọ masịrị ya. 8Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya! Lee ya ka ọ na-abịa, na-amali elu nʼelu ugwu niile, na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.