Native Bible

Song of Songs 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.

Song of Songs 2:4 in English

Song of Songs 2:4 · Berean Standard Bible

He has brought me to the house of wine,* and his banner over me is love.

Context

2E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu, otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ. 3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa, mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ. Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya, mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ. 4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya. 5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa. 6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.