Abụ nke Abụ 2:4
Song of Songs 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.
Song of Songs 2:4 in English
Song of Songs 2:4 · Berean Standard Bible
He has brought me to the house of wine,* and his banner over me is love.
Context
2E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu,
otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ. 3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa,
mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ.
Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya,
mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ. 4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri,
ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya. 5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume;
werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike,
nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa. 6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,
aka nri ya na-ejikụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.