Abụ nke Abụ 2:3
Song of Songs 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa, mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ. Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya, mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.
Song of Songs 2:3 in English
Song of Songs 2:3 · Berean Standard Bible
Like an apricot tree among the trees of the forest is my beloved among the young men. I delight to sit in his shade, and his fruit is sweet to my taste.
Context
1Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn,*
na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu. 2E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu,
otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ. 3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa,
mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ.
Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya,
mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ. 4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri,
ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya. 5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume;
werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike,
nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.