Native Bible

Song of Songs 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn,* na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.

Song of Songs 2:1 in English

Song of Songs 2:1 · Berean Standard Bible

I am a rose of Sharon,* a lily of the valley.

Context

1Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn,* na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu. 2E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu, otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ. 3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa, mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ. Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya, mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.