Abụ nke Abụ 2:7
Song of Songs 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị: Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta, ruo mgbe ọ masịrị ya.
Song of Songs 2:7 in English
Song of Songs 2:7 · Berean Standard Bible
O daughters of Jerusalem, I adjure you by the gazelles and does of the field: Do not arouse or awaken love until the time is right.
Context
5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume;
werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike,
nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa. 6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,
aka nri ya na-ejikụ m. 7Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị:
Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta,
ruo mgbe ọ masịrị ya. 8Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya!
Lee ya ka ọ na-abịa,
na-amali elu nʼelu ugwu niile,
na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile. 9Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele.
Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị,
ọ na-esikwa na oghereikuku
na nʼoghere dị ya na-elebata anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.