Abụ nke Abụ 2:11
Song of Songs 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala.
Song of Songs 2:11 in English
Song of Songs 2:11 · Berean Standard Bible
For now the winter is past; the rain is over and gone.
Context
9Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele.
Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị,
ọ na-esikwa na oghereikuku
na nʼoghere dị ya na-elebata anya. 10Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m,
“Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ,
onye m mara mma, soro m. 11Lee, oge oyi agafeela,
udu mmiri agabigakwala. 12Okoko osisi epupụtala nʼala;
oge eji agụ egwu eruokwala,
a na-anụ abụ nduru
nʼala anyị niile. 13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,*
isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.
Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.
Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.