Native Bible

Song of Songs 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala.

Song of Songs 2:11 in English

Song of Songs 2:11 · Berean Standard Bible

For now the winter is past; the rain is over and gone.

Context

9Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele. Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị, ọ na-esikwa na oghereikuku na nʼoghere dị ya na-elebata anya. 10Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m, “Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ, onye m mara mma, soro m. 11Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala. 12Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile. 13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,* isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.