Abụ nke Abụ 2:10
Song of Songs 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m, “Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ, onye m mara mma, soro m.
Song of Songs 2:10 in English
Song of Songs 2:10 · Berean Standard Bible
My beloved calls to me, “Arise, my darling. Come away with me, my beautiful one.
Context
8Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya!
Lee ya ka ọ na-abịa,
na-amali elu nʼelu ugwu niile,
na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile. 9Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele.
Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị,
ọ na-esikwa na oghereikuku
na nʼoghere dị ya na-elebata anya. 10Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m,
“Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ,
onye m mara mma, soro m. 11Lee, oge oyi agafeela,
udu mmiri agabigakwala. 12Okoko osisi epupụtala nʼala;
oge eji agụ egwu eruokwala,
a na-anụ abụ nduru
nʼala anyị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.