Abụ nke Abụ 2:12
Song of Songs 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile.
Song of Songs 2:12 in English
Song of Songs 2:12 · Berean Standard Bible
The flowers have appeared in the countryside; the season of singing * has come, and the cooing of turtledoves is heard in our land.
Context
10Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m,
“Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ,
onye m mara mma, soro m. 11Lee, oge oyi agafeela,
udu mmiri agabigakwala. 12Okoko osisi epupụtala nʼala;
oge eji agụ egwu eruokwala,
a na-anụ abụ nduru
nʼala anyị niile. 13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,*
isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.
Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.
Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.” 14Nduru m nọ nʼọgba nkume,
nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu,
gosi m ihu gị,
mee ka m nụ olu gị,
nʼihi na olu gị dị ụtọ,
ihu gị makwara mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.