Abụ nke Abụ 2:13
Song of Songs 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,* isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”
Song of Songs 2:13 in English
Song of Songs 2:13 · Berean Standard Bible
The fig tree ripens its figs; the blossoming vines spread their fragrance. Arise, come away, my darling; come away with me, my beautiful one.”
Context
11Lee, oge oyi agafeela,
udu mmiri agabigakwala. 12Okoko osisi epupụtala nʼala;
oge eji agụ egwu eruokwala,
a na-anụ abụ nduru
nʼala anyị niile. 13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,*
isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.
Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.
Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.” 14Nduru m nọ nʼọgba nkume,
nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu,
gosi m ihu gị,
mee ka m nụ olu gị,
nʼihi na olu gị dị ụtọ,
ihu gị makwara mma. 15Jidenụ nkịta ọhịa,
ụmụ nkịta ọhịa niile
na-emebiri anyị ubi,
ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.