Native Bible

Song of Songs 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,* isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”

Song of Songs 2:13 in English

Song of Songs 2:13 · Berean Standard Bible

The fig tree ripens its figs; the blossoming vines spread their fragrance. Arise, come away, my darling; come away with me, my beautiful one.”

Context

11Lee, oge oyi agafeela, udu mmiri agabigakwala. 12Okoko osisi epupụtala nʼala; oge eji agụ egwu eruokwala, a na-anụ abụ nduru nʼala anyị niile. 13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,* isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.” 14Nduru m nọ nʼọgba nkume, nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu, gosi m ihu gị, mee ka m nụ olu gị, nʼihi na olu gị dị ụtọ, ihu gị makwara mma. 15Jidenụ nkịta ọhịa, ụmụ nkịta ọhịa niile na-emebiri anyị ubi, ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.