Abụ nke Abụ 2:14
Song of Songs 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nduru m nọ nʼọgba nkume, nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu, gosi m ihu gị, mee ka m nụ olu gị, nʼihi na olu gị dị ụtọ, ihu gị makwara mma.
Song of Songs 2:14 in English
Song of Songs 2:14 · Berean Standard Bible
O my dove in the clefts of the rock, in the crevices of the cliff, let me see your face, let me hear your voice; for your voice is sweet, and your countenance is lovely.
Context
12Okoko osisi epupụtala nʼala;
oge eji agụ egwu eruokwala,
a na-anụ abụ nduru
nʼala anyị niile. 13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,*
isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.
Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.
Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.” 14Nduru m nọ nʼọgba nkume,
nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu,
gosi m ihu gị,
mee ka m nụ olu gị,
nʼihi na olu gị dị ụtọ,
ihu gị makwara mma. 15Jidenụ nkịta ọhịa,
ụmụ nkịta ọhịa niile
na-emebiri anyị ubi,
ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko. 16Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya.
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.