Abụ nke Abụ 2:15
Song of Songs 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jidenụ nkịta ọhịa, ụmụ nkịta ọhịa niile na-emebiri anyị ubi, ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.
Song of Songs 2:15 in English
Song of Songs 2:15 · Berean Standard Bible
Catch for us the foxes— the little foxes that ruin the vineyards— for our vineyards are in bloom.
Context
13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,*
isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.
Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.
Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.” 14Nduru m nọ nʼọgba nkume,
nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu,
gosi m ihu gị,
mee ka m nụ olu gị,
nʼihi na olu gị dị ụtọ,
ihu gị makwara mma. 15Jidenụ nkịta ọhịa,
ụmụ nkịta ọhịa niile
na-emebiri anyị ubi,
ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko. 16Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya.
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi, 17tutu chi ụtụtụ abọọ
mgbe onyinyo niile na-agabigakwa.
Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya,
dị ka mgbada
maọbụ nwa ele
nke nọ nʼelu ugwu.
2:1 Okoko osisi a bụ otu nʼime okoko osisi ndị na-epu nʼọkọchị, na ndịda akụkụ osimiri Kamel Aịz 35:1-2
2:13 Osisi fiig na-amị mkpụrụ ugboro abụọ nʼafọ nʼIzrel. Ọ bụ nʼoge ọkọchị ka ọ kachasị amị mkpụrụ, amaokwu a na-ekwu banyere owuwe ihe ubi nke mkpụrụ fiig mbụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.