Abụ Ọma 9:13
Psalms 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m! Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
Psalms 9:13 in English
Psalms 9:13 · Berean Standard Bible
Be merciful to me, O LORD; see how my enemies afflict me! Lift me up from the gates of death,
Context
11Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.
Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya. 12Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;
ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya. 13O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m!
Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ, 14ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị
nʼọnụ ụzọ ama* niile nke ada Zayọn,
nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị. 15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru;
ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.