Native Bible

Psalms 9:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe; ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.

Psalms 9:12 in English

Psalms 9:12 · Berean Standard Bible

For the Avenger of bloodshed remembers; He does not ignore the cry of the afflicted.

Context

10Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ. 11Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn. Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya. 12Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe; ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya. 13O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m! Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ, 14ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama* niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.