Abụ Ọma 9:10
Psalms 9:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
Psalms 9:10 in English
Psalms 9:10 · Berean Standard Bible
Those who know Your name trust in You, for You, O LORD, have not forsaken those who seek You.
Context
8Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe;
jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile. 9Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.
Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu. 10Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ. 11Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.
Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya. 12Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;
ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.