Abụ Ọma 9:11
Psalms 9:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn. Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
Psalms 9:11 in English
Psalms 9:11 · Berean Standard Bible
Sing praises to the LORD, who dwells in Zion; proclaim His deeds among the nations.
Context
9Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.
Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu. 10Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ. 11Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.
Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya. 12Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;
ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya. 13O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m!
Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.