Native Bible

Psalms 9:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama* niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.

Psalms 9:14 in English

Psalms 9:14 · Berean Standard Bible

that I may declare all Your praises— that within the gates of Daughter Zion I may rejoice in Your salvation.

Context

12Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe; ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya. 13O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m! Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ, 14ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama* niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị. 15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha. 16Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.