Abụ Ọma 9:16
Psalms 9:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela
Psalms 9:16 in English
Psalms 9:16 · Berean Standard Bible
The LORD is known by the justice He brings; the wicked are ensnared by the work of their hands. Higgaion Selah *
Context
14ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị
nʼọnụ ụzọ ama* niile nke ada Zayọn,
nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị. 15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru;
ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha. 16Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi;
ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela 17Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili;
nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke. 18Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa;
olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.