Native Bible

Psalms 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.

Psalms 9:17 in English

Psalms 9:17 · Berean Standard Bible

The wicked will return to Sheol— all the nations who forget God.

Context

15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha. 16Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela 17Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke. 18Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa; olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu. 19O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ; ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.