Abụ Ọma 78:57
Psalms 78:57 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma.
Psalms 78:57 in English
Psalms 78:57 · Berean Standard Bible
They turned back and were faithless like their fathers, twisted like a faulty bow.
Context
55Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha,
tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa;
o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha. 56Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa,
nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu;
ha edebeghị ụkpụrụ ya. 57Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ,
ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma. 58Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya;
sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya. 59Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu.
Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.