Native Bible

Psalms 78:58 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya.

Psalms 78:58 in English

Psalms 78:58 · Berean Standard Bible

They enraged Him with their high places and provoked His jealousy with their idols.

Context

56Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya. 57Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma. 58Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya. 59Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam. 60Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo* azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.