Abụ Ọma 78:56
Psalms 78:56 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya.
Psalms 78:56 in English
Psalms 78:56 · Berean Standard Bible
But they tested and disobeyed God Most High, for they did not keep His decrees.
Context
54Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya,
ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara. 55Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha,
tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa;
o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha. 56Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa,
nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu;
ha edebeghị ụkpụrụ ya. 57Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ,
ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma. 58Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya;
sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.