Abụ Ọma 78:55
Psalms 78:55 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.
Psalms 78:55 in English
Psalms 78:55 · Berean Standard Bible
He drove out nations before them and apportioned their inheritance; He settled the tribes of Israel in their tents.
Context
53O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha,
ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha. 54Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya,
ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara. 55Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha,
tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa;
o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha. 56Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa,
nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu;
ha edebeghị ụkpụrụ ya. 57Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ,
ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.