Native Bible

Psalms 78:60 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo* azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.

Psalms 78:60 in English

Psalms 78:60 · Berean Standard Bible

He abandoned the tabernacle of Shiloh, the tent He had pitched among men.

Context

58Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya. 59Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam. 60Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo* azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ. 61O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka. 62O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.