Native Bible

Psalms 78:61 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka.

Psalms 78:61 in English

Psalms 78:61 · Berean Standard Bible

He delivered His strength to captivity, and His splendor to the hand of the adversary.

Context

59Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam. 60Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo* azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ. 61O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka. 62O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya. 63Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.