Native Bible

Psalms 78:62 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya.

Psalms 78:62 in English

Psalms 78:62 · Berean Standard Bible

He surrendered His people to the sword because He was enraged by His heritage.

Context

60Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo* azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ. 61O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka. 62O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya. 63Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha; 64E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.