Native Bible

Psalms 57:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.

Psalms 57:3 in English

Psalms 57:3 · Berean Standard Bible

He reaches down from heaven and saves me; He rebukes those who trample me. Selah God sends forth His loving devotion and His truth.

Context

1Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa. 2Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. 3Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. 4Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha. 5O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.