Abụ Ọma 57:2
Psalms 57:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.
Psalms 57:2 in English
Psalms 57:2 · Berean Standard Bible
I cry out to God Most High,* to God who fulfills His purpose for me.
Context
1Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere,
nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba.
Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba
tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa. 2Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. 3Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m
na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela
Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. 4Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm;
amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa,
ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe,
ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.