Abụ Ọma 57:1
Psalms 57:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.
Psalms 57:1 in English
Psalms 57:1 · Berean Standard Bible
Have mercy on me, O God, have mercy, for in You my soul takes refuge. In the shadow of Your wings I will take shelter until the danger has passed.
Context
1Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere,
nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba.
Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba
tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa. 2Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. 3Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m
na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela
Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.