Abụ Ọma 57
Psalms 57 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere,
nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba.
Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba
tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa. 2Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. 3Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m
na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela
Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. 4Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm;
amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa,
ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe,
ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha. 5O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile;
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. 6Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ,
ihe mgbu nyịturu m.
Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe,
ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Sela 7Obi m dị njikere, o Chineke,
obi m dị njikere sikwaa ike;
aga m abụ abụ, kụkwaa egwu. 8Teta nʼụra mkpụrụobi m!
Teta, ụbọ akwara na une!
Aga m akpọte chi ọbụbọ. 9O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile;
aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. 10Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe;
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. 11O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe;
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.