Native Bible

Psalms 58 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 58
1Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi? O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ? 2Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu, aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa. 3Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu; site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha. 4Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ, na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri, 5nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya, nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị. 6O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ; o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a! 7Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ; mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie. 8Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ. 9Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume. 10Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ, mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume. 11Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị, “Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ; nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.