Native Bible

Psalms 58:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.

Psalms 58:8 in English

Psalms 58:8 · Berean Standard Bible

Like a slug that dissolves in its slime, like a woman’s stillborn child, may they never see the sun.

Context

6O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ; o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a! 7Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ; mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie. 8Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ. 9Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume. 10Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ, mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.