Abụ Ọma 58:9
Psalms 58:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.
Psalms 58:9 in English
Psalms 58:9 · Berean Standard Bible
Before your pots can feel the burning thorns— whether green or dry— He will sweep them away.
Context
7Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ;
mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie. 8Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya;
dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ. 9Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu,
ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume. 10Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ,
mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume. 11Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị,
“Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ;
nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.