Abụ Ọma 58:3
Psalms 58:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu; site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.
Psalms 58:3 in English
Psalms 58:3 · Berean Standard Bible
The wicked are estranged from the womb; the liars go astray from birth.
Context
1Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi?
O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ? 2Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu,
aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa. 3Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu;
site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha. 4Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ,
na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri, 5nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya,
nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.