Abụ Ọma 57:8
Psalms 57:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
Psalms 57:8 in English
Psalms 57:8 · Berean Standard Bible
Awake, my glory!* Awake, O harp and lyre! I will awaken the dawn.
Context
6Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ,
ihe mgbu nyịturu m.
Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe,
ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Sela 7Obi m dị njikere, o Chineke,
obi m dị njikere sikwaa ike;
aga m abụ abụ, kụkwaa egwu. 8Teta nʼụra mkpụrụobi m!
Teta, ụbọ akwara na une!
Aga m akpọte chi ọbụbọ. 9O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile;
aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. 10Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe;
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.