Abụ Ọma 57:4
Psalms 57:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.
Psalms 57:4 in English
Psalms 57:4 · Berean Standard Bible
My soul is among the lions; I lie down with ravenous beasts— with men whose teeth are spears and arrows, whose tongues are sharp swords.
Context
2Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu,
Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. 3Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m
na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela
Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. 4Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm;
amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa,
ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe,
ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha. 5O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile;
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. 6Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ,
ihe mgbu nyịturu m.
Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe,
ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Sela
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.